ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Jụn 1936 ![]() |
Ụbọchị ọnwụ ya | 12 Jụn 2001 ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | odee akwụkwọ, university teacher ![]() |
onye were ọrụ | Michigan State University ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Indiana University, University of Ibadan ![]() |
Ọrụ ama ama | My Mercedes Is Bigger than Yours, Danda ![]() |
Nkem Nwankwo Audio (12 June 1936 ruo 12 June 2001) bụ onye ode akwụkwọ na onye ode abụ nke Naijiria . [1]
A mụrụ ya na Nawfia-Awka, obodo dị nso na obodo Igbo bụ Onitsha na Naịjịrịa, Nwankwo gara University College na Ịbadan, nweta akara nzere BA n'afọ 1962. [2] Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ọ nwetara ọrụ nkuzi na Ibadan Grammar School, tupu ọ gaa n'ihu ide akwụkwọ akụkọ magazin, gụnyere Drum na-arụ ọrụ na Nigerian Broadcasting Corporation . [3]
O dere ọtụtụ akụkọ maka ụmụaka bụ nke ebipụtara na 1963 dị ka Tales Out of School. [4] O derekwara Tales out of School ọzọkwa na 1965. [4]
Dịka Onye edemede obere akụkọ na uri, Nwankwo nwetara nlenyere anya na akwụkwọ mbụ ya bụ Danda na (1964), [5] bụ nke e mere dịka egwu nke etinyere na 1966 World Festival of Negro Arts na Dakar, Senegal . [3] N’oge agha obodo Nigeria Civil war Nwankwo rụrụ ọrụ na Biafra’s Arts Council. [6] Na 1968, site na njiko aka nke ya na Samuel X. Ifekjika, o dere Biafra: The Making of a Nation . [7] Mgbe agha obodo gasịrị, ọ laghachiri Lagos wee rụọ ọrụ na akwụkwọ akụkọ mba, Daily Times . Ọrụ ndị sochirinụ gụnyere satire My Mercedes Is Bigger than Yours .
N’afọ 1970 gawa, Nwankwo nwetara akara ugo mmụta Master na Ph.D. na Mahadum Indiana . [8] O dekwara gbasara nrụrụ aka na Naịjirịa . Ọ nọrọ njedebe nke ndụ ya na United States wee kuzie na Mahadum Michigan State na Tennessee State University . [9]
Ọ nwụrụ n'ụra ya na Tennessee, site na nsogbu sitere na ọrịa obi nke ọ na-arịa kemgbe ọtụtụ afọ. [10]