ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | New Zealand |
ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Eprel 1988 |
Ebe ọmụmụ | Auckland |
ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu |
ebe agụmakwụkwọ | Monash University |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
Nneka Okpala (amụrụ na 27 Eprel 1988) bụ onye na-eme egwuregwu na New Zealand. Ọ na-asọ mpi karịsịa na ịwụli elu atọ.[1][2] O meriri asọmpi ịwụli elu atọ nke ụmụ nwanyị New Zealand ugboro ise na asọmpi ịli elu atọ ụmụ nwanyị Australia otu ugboro.[3][4]
Nne na nna Okpala si Naijiria kwaga New Zealand na 1987, a mụkwara Okpala na Otahuhu, Auckland n'afọ sochirinụ.[5] Ọ sonyeere Papatoetoe Athletics Club mgbe ọ dị afọ isii, mgbe ọ dị iri na ise ọ malitere ịsọ mpi na ịwụli elu atọ.[6] Afọ abụọ ka e mesịrị, ọ nọchitere anya New Zealand na 2005 IAAF World Youth Championships na Morocco.[3] N'otu afọ ahụ, ọ nọchitekwara anya New Zealand na Sydney Youth Games.[1]
N'afọ 2015, ọ sonyeere New Zealand na World University Games na Korea, na-emecha nke asatọ na triple jump, mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na Monash University, Melbourne.[3][7] Tụkwasị na nke a, na 2015, Okpala meriri Essendon Athletics Club Athlete of the Year award ma kpọọ ya Monash University Female Athlete of The Year.[6]
Okpala gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Monash na nzere masta na ahụike mba ụwa.[8]