ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 18 Maachị 1984 |
Ebe ọmụmụ | Anambara Steeti, Lagos |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye nhazi ederede |
ebe agụmakwụkwọ | Imo State University |
Nuella Njubigbo Audio
Amụrụ ya na Anambra steetị. O bụ nwaafọ Naijiria.
Akaọrụ ya - Onye na-eme ihe nkiri, onye na-ede ihe nkiri.
Nuella Njubigbo bụ onye na-eme ihe nkiri, onye na-ede ihe nkiri, onye nlereanya na onye ama ama maka ịpụta na telivishọn na Naijiria. O sonyeere ezinụlọ nke Nollywood n'afọ 1999 ma bụrụ onye a họpụtara maka onyinye Rising Star Award na Nollywood Movies Awards n'afọ 2012.
Ọ bụ onye Anambra steetị . Ọ gụrụ Government and Public Administration na Imo State University. O fere ala nna ya bụ Naijiria na Delta Steetị mgbe o mere emume ndi ntorobia akpọrọ National Youth Service Corps .
N'abali iri abụọ na itolu nke onwa maachi n'afọ 2014, O lụrụ onye nduzi ihe nkiri aha ya bụ Tchidi Chikere na ụlọ ezinụlọ ya na steeti Anambra. Njikọ ha bụurụ isiokwu nke mgbasa ozi n'ụbọchị ole na ole n'ihi na dị ya alụbuọla nwanyị ọzọ na-eme ihe nkiri agha ya bụ Sophia Chikere ma nwere ụmụ atọ. Otu ọ dị, dịka ndị ọha ka na-eti mkpu, Tchidi kwuru ihe kpatara mgbasa nke alụmdi na nwunye mbụ ya.