aha | Omo Ghetto: The Saga |
---|---|
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ebe | Naijiria |
mmekorita ya na | Nollywood |
ụdị | action film, adventure film, comedy film, drama film |
ndi mgbasa ozi | Netflix |
mba osi | Naijiria |
Mmalite asụsụ ihe ngosi | Bekee |
asụsụ eji dee ọrụ | Bekee |
afọ/ụbọchị mbipụta | 2020 |
ụbọchị mmepụta | 2020 |
Onye nduzi | Funke Akindele-Bello, JJC |
Ihe nrite | Africa Magic Viewers' Choice Awards |
ahọpụtara maka | Africa Magic Viewers' Choice Awards, Africa Movie Academy Awards |
usoro nkesa | video on demand |
ụbọchị ọkwa | Disemba 2020 |
Omo Ghetto: The Saga akpọkwaara dị ka Omo Ghetto 2 [1] bụ ihe nkiri Niajiria nke a'ewepụtara n'afọ 2020 bụ ihe nkiri ntọchi nke ndị otu ama ama,nke Funke Akindele na JJC Skillz so duzie. [2] Ndị gosipụtara agwa n'ihe nkiri a bụ Funke Akindele, Chioma Akpota, Nancy Isime, Eniola Badmus, Bimbo Thomas, Deyemi Okanlawon na Mercy Aigbe na ndị isi ọrụ. Nke a bụ ihe nkiri nke abụọ na franchise Omo Ghetto ma bụrụkwa usoro ihe nkiri 2010 bụ Omo Ghetto . [3] Ihe nkiri ahụ nwere mwepụta ihe nkiri ya dabara na ekeresimesi na Disemba 25 2020 wee meghe na nyocha dị mma sitere na ndị nkatọ. [4] Ihe nkiri ahụ ghọrọ ihe ịga nke ọma n'ụlọ ọrụ wee karịa Fate of Alakada dị ka ihe nkiri Nigeria kacha enweta ego n'afọ 2020. [5] Dị ka 26 Jenụwarị 2021, mgbe ihe nkiri ahụ nwetara nde naịra iri anọ na iri isii na asatọ n'ụlọ box ọfịsị, ọ karịrị ndekọ ihe nkiri 2016 The Wedding Party wee bụrụ ihe nkiri kachasị enweta ego na ụlọ ọrụ ihe nkiri Nigeria. [6] [7]
Akindele kwuputara banyere mmepụta nke usoro a na February 2020 site na foto ochie ọ hụrụ onwe ya yana Eniola Badmus na Instagram. Isi foto nke ihe nkiri a malitekwara na February 2020. [8] Ihe nkiri a gosikwara nkwado njikọ n'etiti Funke Akindele na di ya JJC Skillz dịka ndị na-eduzi ihe nkiri ahụ. [9] Esekwara ụfọdụ akụkụ ihe nkiri ahụ na Dubai, United Arab Emirates nke mmepụta ihe nkiri ahụ n'ihi ọrịa COVID-19 nyere ya ihe ịma aka n'ihu . [10]
E gosikwara onye na-agụ egwu ama ama Naira Marley n'ime ihe nkiri a na-eme ihe nkiri na mpụta mbụ site na ihe nkiri a. [11] Yemi Alade, onye na-agụ egwú mekwara ihe ngosi mbụ site n'ihe nkiri a ma rukws ọrụ dị mkpa.
Ihe nkiri a ritere ihe karịrị nde naira otu narị na iri asatọ na iteghete n'izu mmalite kemgbe ewepụtara ya ma bụrụ ihe akụkọ nke bụ ihe nkiri Nollywood mbụ nwetara ihe karịrị nde naịra iri iteghete na iteghete na ngwụcha izu mmalite ya karịa ndekọ nke The Wedding Party 2 debere na mbụ. [5] N'ime izu nke abụọ ya, ihe nkiri ahụ gara n'ihu n'eru ogo dị elu ndekọ ụlọ ọrụ site n'itinye ihe karịrị otu nde naịra na iri atọ na abụọ na ụma anọ. wee nọrọ n'ogo kacha n'igbe ego ụlọ ọrụ nke Nigeria wee weta mkpokọta izu abụọ ya na ndekọ ego nde narị naịra atọ na iri abụọ na abụọ wee tinye ya dị ka ihe nkiri nke anọ kachasị elu iweta ego n' ihe nkiri Nigeria. [12]
N'ime izu nke atọ ya, n'agbanyeghị na ọ hụrụ mbelata nke pacenti iri anọ na atọ site na izu gara aga, Omo Ghetto ka nọ n'ogo dị elu n'igbe ụlọ ọrụ wee nweta nde naịra iri asaa na ise n'achịkọta mgbakọta ya ịbụ nde narị naịra atọ na iri iteghete na asatọ ka izu atọ gachara. Omo Ghetto wuru ewu nke mere na ọ ruru ihe dịka pacenti iri isii na ise na nke igbe ụlọ ọrụ na Nigeria. [13] Omo Ghetto gara n'ihu na-achị n'ogo n'ụlọ ọrụ igbe Naijiria, na-ebili ruo nchịkọta nde naira iri anọ na ise ,n'ụma ise.. O wetara ọnụ ọgụgụ igbe ụlọ ọrụ ruru nde narị naira anọ na iri anọ na anọ, n'ụma ise nke ya ihe nkiri Nollywood nke abụọ kacha enweta ego mgbe naanị izu anọ gachara, Omo Ghetto the saga bụ ugbu a ihe nkiri Nigeria kacha enweta ego nke bụ nde pụrụ nde 468,036,300 naanị ihe karịrị otu ọnwa [14]
Omo Ghetto gara n'ihu na-achị igbe ụlọ ọrụ n'ime izu nke ise ya na-enweta narị atọ na ise, n'ụma asaa [15] wee weta mkpokọta ya nde narị naịra anọ na iri asato n'ụma ise wee bụrụ ihe nkiri Nollywod kacha enweta ego n'oge niile n'agbanyeghị ọrịa COVID-19. Ihe nkiri ahụ gara n'ihu gbatịa ndekọ ya site n'ịghọ ihe nkiri Nollywood nke mbụ nọrọ n'izu isii n'usoro n'elu igbe ụlọ ọrụ, na-enweta nde naira atọ na otu,n'ụma ise ọzọ. [16] N'akụkọ ihe gara aga, ọ ghọrọ ihe nkiri Nigeria mbụ nwetara nde narị naịra ise n'igbe ụlọ ọrụ Nollywood. [17]
Ihe nkiri ahụ ka nọ n'ọkwa n'ọfis n'izu nke asaa, na-enwetakwu nde naịra iri abụọ na asaa, n'ụma atọ. [18] eweta mkpokọta ya ka ọ bụrụ nde narị naịra ise na iri atọ na iteghete , n'ụma isii. Omo Ghetto meriri igbe ọrụ n'izu nke asatọ, itoolu na nke iri n'otu n'otu wee bụrụ naanị ihe nkiri nke abụọ na n'ogige Ọdịda Anyanwụ nke Afrika n'asụ asụsụ bekee gafere nde narị naịra isii ka Black Panther gachara.
Afọ | Ihe nrite | Otu | onye nnata | Nsonaazụ | Ref |
---|---|---|---|---|---|
2021 | Africa Movie Academy Awards | Onye na-eme ihe nkiri kacha mma n'ọrụ isi | Pending | [19] | |
Mmeri na Ndezi | Omo Ghetto | Pending | ||||
Pending |
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content