E guzobere Otu Na-ahụ Maka Ikike Ruuru Mmadụ na Mba Naijiria (“NHRC”) site na iwu nke amadebere maka Otu Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ (Ndezigharị), na afọ 1995, nke iwu NHRC megharịrị, na afọ 2010. Otu nkea na ahụ maka usoro na egbochi mmebi iwu nke na-echekwa ikike mmadụ nke ndị bi na obodo Naijiria. Ọ na-enyocha ikike ruuru mmadụ na Naịjirịa, na-enyere ndị e metọrọ aka maka imebi ikike ruuru mmadụ aka, ma na-enye aka n'ịwepụta amụma gọọmentị nke Naịjirịa gbasara ikike oruuru mmadụ. [1]
Otua na-arụ ọrụ na nyocha na nlekota nke ọtụtụ ọnọdụ ikike ruuru mmadụ kemgbe ọ malitere. [2] Otu nke Amnesty International welitere olu tinyere ihe gbasara ụjọ ndị uweojii na Naịjirịa na enye Otu Na-ahụ Maka Ikike Ruuru Mmadụ na Mba Naijiria na afọ 2012. [3]
Onye Isi Ode Akwukwo ugbu a bụ Anthony O. Ojukwu Esq. [4]