ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
obodo maka egwuregwu | Naijiria ![]() |
aha enyere | Precious ![]() |
aha ezinụlọ ya | Dede ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 18 Jenụwarị 1980 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Abá ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | omee, Onye otu egwuregwu bọọlụ ![]() |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | Ochee bọọlụ ![]() |
onye nsonye òtù egwuregwu | Delta Queens, Nigeria women's national football team, Arna-Bjørnar, Delta Queens, Rivers Angels F.C. ![]() |
Ụcha ime anya | black ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
ụdị egwuregwu | footbọl ![]() |
so na | 2008 Summer Olympics, 2004 Summer Olympics, 2007 FIFA Women's World Cup ![]() |
Precious Uzoaru Dede Audio (onye amụrụ na 18 Jenụwarị 1980 na Lagos ) bụ nwaanyị onye na-eche nche bọọlụ nke Naijiria lara ezumike nka, o gbaara ọtụtụ klọb gụnye Delta Queens FC, Ibom Queens na Arna-Bjørnar, tinyekwara ịpụta ugboro iri itoolu maka otu Ndi ụmụnwaanyi bọọlụ Naijiria .
Dede kwetara ibanye na klọb Arna-Bjørnar nke di na Bergen Norway site na 30 March 2009 ruo otu afọ. A kpọbatara Dede mgbe onye otụ ha bụ Erika Skarbø merụrụ aru.[1]
Dede esonyela na-ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'afọ ndị gara aga, gụnye asọmpi Iko ụwa niile nke umu nwaanyi emere na 2003, 2007, 2011[2], 2015, asọmpi Olympic nke Sydney 2000, Athens 2004 na Beijing 2008, [3] na asọmpi iko African Women's Championship asọmpi nke 2008, 2010, 2012 na 2014, na-emeri ya ugboro abụọ ( 2010, 2014 )[4].
Na mbu, mgbe ọ gbachara bọọlụ ụmụnwanyị Afrika, ọ nwara ịla ezumike nka bọọlụ mba uwa mana ndị otu ya mere ya nọgide site na asompi mba ụwa nke afo 2015. Mgbe emechara asọmpi ahụ, ọ lara ezumike nká ya na Machị 2016. Ọ bụ onye bọọlu nọrọ ogologo oge na ndị otu bọl ahu n'agbanye na ewepụrụ aha ya na asọmpi Olympic nke 2016. [5]
O kpebiri igaa ezumike egwuregwu na Ọktoba n'afọ 2016. ọ siri na "Enwere m obi ụtọ igba bọọlụ na ọkwa klọb ma na inọchiri ndi obodo m, ọ bụ ekpere chukwu zaraam. Enwere m ekele na m nọrọ ihe karịrị afọ iri n'ịgba bọọlụ ụmụ nwanyị, eji m ụgwọ dị ukwuu maka egwuregwu kachasị mma n'ụwa." [6]