ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
obodo maka egwuregwu | Naijiria ![]() |
aha ezinụlọ ya | Ajibade ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 8 Disemba 1999 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Mushin ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ ![]() |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | gaa n'ihu ![]() |
Ụcha ime anya | black ![]() |
ụcha ntụtụ isi | green hair ![]() |
ụdị egwuregwu | footbọl ![]() |
so na | 2018 WAFU Women's Cup, 2017 Nigeria Women Premier League, 2018 Africa Women Cup of Nations, 2019 FIFA Women's World Cup, football at the 2024 Summer Olympics – women's tournament ![]() |
Templeeti:Infobox football biographyRasheedat Ajibade onye amụrụ na abalị asatọ n'ime ọnwa Disemba n'afo1999[1] bụ nwaafọ Naịjirịa maara egwuregwu bọọlụ na- agbara Avaldsnes IL bọọlụ na Toppserien na otu Nigeria women's national football team . Ajibade nọchitere anya Nigeria na asọmpi oyi ebiri, tupu ịgba asọmpi mbụ ya maka ndị otu egwuregwu na 2018 WAFU Cup na Côte d'Ivoire. Na 2017, a họ́pụ̀tàrà ya dịka otu n'ime mmadụ iri nke ndị egwuregwu bọọlụ na-eto eto kachasị mma na mpaghara Africa site na Goal.com . [2]
Ajibade anọchitela anya Naịjirịa n'ogo afọ iri na asaa, ndị na- erubeghi afọ iri abụo nakwa ndị otu egwu bọọlụ sinịọ [3] Ọ nọọrọ-ndị òtù bọọlụ FC Robo n'egwu kemgbe oge Nigeria Women Premier League 2013 . Na 2014, edepụtara ya dị ka otu n'ime ndị N'eto eto ụ́kwụ́ na aghọ nko na ngalaba egwuregwu a. [4] N'ọ́nwa Septemba 2018, o meriri n'asọmpi egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa nke ugboro abụọ áchàghị̀ acha. [5]
N'ime oge egwuregwu 2015 Nigeria Women Premier League izu nke abụọ, e depụtara aha Ajibade dịka ndị nlereanya nke izu ahụ, nke Soccerladuma South Africa chịkọbara, n'agbanyeghị na Confluence Queens meriri ha n'oge agba egwuregwu a. [6] N'oge 2017 Nigeria Women Premier League, emere Ajibade dịka kaptin ndị otu FC Robo . [7] Ajibade bụ otu n’ime ndị nyere akara ya na mmeri Robos n’ụlọ ha megide ndị Ibom Angels n’oge a. [8] Na 13 Julaị 2017, mgbe ndị ọbịa bịara bụ Rivers Angels merichara ndị òtù ya, Ajibade bụ onye SuperSport hotara iji mee ka ndị otu ya nwee ike iru Super 4, n'ihi ọdịiche dị na ákàrà na ọnụ ọgụgụ egwuregwu ole na ole fọdụrụ. [9] Ajibade meriri ḿbípụ̀tá mbụ nke Nigeria National Freestyle Championship, nke bụ asọmpi iji kwalite onyinye amara ònyé n'egwu bọọlụ . [10] Na 2017, agbanyeghị na Robo esoghị na otu egwuregwu ndị mechara, Ajibade bụ onye bọọlụ elegaara anya nke oge a ka o nyechara goolu asatọ iji zọpụta ndị otu ya. [11] Na Mee 2018, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye kacha mma n'egwu ball na 2017 Nigeria Women Premier League na Nigeria Pitch Awards . [12] Na Disemba 2018, a kọrọ na Ajibade bịanyere aka na nkwekọrịta afọ abụọ na akụkụ Norwegian, Avaldsnes IL, otu egwuregwu na -agba na Toppserien . [13] [14]
N'asọmpi ndị mmeri n'Afrịka, ka ha na-aga asọmpi iko mba ụwa FIFA FIFA U-17 nke afọ 2014, Ajibade nwetara ọkpụ goolu abụọ maka mmeri mbụ Naịjirịa meriri Namibia. [15] ka asọmpi malitere, Ajibade nyere goolu mmeri na egwuregwu mbụ Naịjirịa na China . [16] N’egwuregwu bọọlụ ikpeazụ ha na Mexico, Ajibade nyere goolu na Naịjirịa, mmeri ọkpụ goolu abụọ iji kwalite ndọrọ ndọrọ ịbụ onye mmeri agba nke anọ ha na ndị Spen[17]
A kpọrọ Ajibade na Coach Bala Nikiyu 21-man squad maka 2016 FIFA U-17 Women World Cup, ma yiri jeesi nọmba 10. [18] [19] Na asọmpi a, Ajibade bụ kaptin ndị Naịjirịa, wee gwa FIFA.com na mkpebi nke otu a bụ ime nke ọma karịa agba nke anọ na nke ikpeazụ ha mechara n'afọ 2014. [20] Ajibade sokwa na ndị egwuregwu Naịjirịa na 2016 FIFA U-20 Women's World Cup, akpọrọ ya onye nwe-egwu n'otu egwuregwu nke abụọ ha na Canada . [21]
N'egwuregwu agba mbụ emere iji chọpụta onye nnọchi anya Afrịka na 2018 FIFA U-20 Women's World Cup, Ajibade nwetara ọkpụ goolu abụọ n'asọmpi mbụ ha gbara na Tanzania, nke nyere Naịjirịa ohere ọkpụ goolu atọ tupu agbaa bọọlụ na Dar e Sallam. [22] Na nlọghachite ịgbagharị egwuregwu, nke emere na Ọktoba 2017, Ajibade nyere goolu abụọ nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu isii merie ndị be ha. [23] Na 27 Jenụwarị 2018, Ajibade nyere goolu abụọ na mmeri isii nke Nigeria meriri South Africa, mmeri ahụ gosipụtara ntozu Nigeria maka 2018 FIFA U-20 Women World Cup na France. [24]
Na February 2018, Ajibade n'akụkụ Joy Jegede, Osarenoma Igbinovia na ndị egwuregwu iri na asatọ ndị ọzọ họpụtara site n'aka onye isi nchịkwa, Thomas Dennerby ka ọ nọchite anya Nigeria na mbipụta mmalite nke WAFU Cup na Côte d'Ivoire. [25] N'egwuregwu bọọlụ nke abụọ n'asọmpi mpaghara ahụ, Ajibade gbaturu ọkpụ atọ butere Naịjirịa na ọkara-ikpeazụ ya na-agba egwuregwu mbụ. [26] [27]
Ajibade so na otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị mba 2018 Afrịcan Nations Championship Nigeria women's national football team ebe o meriri asọmpi a tinyere ndị otu ahụ. [28]