ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | South Africa ![]() |
aha ezinụlọ ya | Fox ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Septemba 1924 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Durban ![]() |
Ụbọchị ọnwụ ya | 13 Disemba 2004 ![]() |
nwa | Justin D. Fox ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-ese ụkpụrụ ụlọ ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of Cape Town ![]() |
esemokwu | World War II ![]() |
Ihe nrite | Order of the Baobab ![]() |
Revel Fox (ubochí irí abụọ n'ọnwa Septemba 1924 rụo ụbọchị irí na àtó n'ọnwa Disemba 2004) bụ onye na-ese ụkpụrụ ụlọ na South Africa. Ónyé guzobere Revel Fox na Partners.[1][2]
A mụrụ Revel Fox na Durban na 1924, n'ezinụlọ Albert John Charles Fox, ónyé ọrụ mbubata, na Ivy Priscilla Ellis. Ka ọ na-erule ógè ọ gụsịrị akwụkwọ na Durban Boys' High School Agha Ụwa nke Abụọ amalitela ma ọ chọrọ isonyere ndị agha. Mgbè ọnwa iri na asatọ nke ịmụ ihe owuwu gasịrị, ọ debanyere aha ma zigara ya Ịtali dị ka akụkụ nke Special Service Battalion. Mgbè Agha ahụ gasịrị, Revel Fox laghachiri na Mahadum Cape Town na-enweta nzere na B Arch na 1948 (Honoris Causa) nke mahadum abụọ nyèrè ya, Mahadum Natal (1993) na Mahadim Cape Town (2001). Mgbè ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum, ọ rụrụ ọrụ na Rhodesia (Zimbabwe) na n'ọfịs Anders Tengbom na Stockholm, Sweden. N'afọ 1952, ọ laghachiri South Africa, wee guzobe ọrụ na Worcester na Western Cape, mepee ọrụ na Cape n'afọ 1953. Na Worcester, o tinyere aka n'ọtụtụ ọrụ mweghachi.[2]
Site na 1960 ruo 1963 edepụtara ya dị ka ónyé enyemaka ónyé nkuzi na ndekọ ndị ọrụ nke Mahadum Cape Town. O nwetara nzere masta nke Urban and Regional Planning na Mahadum Cape Town n'afọ 1969. Site na 1973 ruo 1975 Fox bụ ónyé ísí óchè nke Cape Provincial Institute of Architects, 1998 na 1999 ọ rụrụ ọrụ dị ka Ónyé ísí óchè nke Kansụl nke Mahadum Cape Town. Revel Fox bụ ónyé otu Advisory Board nke Faculty of Engineering and the Built Environment na Mahadum Cape Town.
A maara Fox màkà imegide ọchịchị ịkpa ókè agbụrụ ma kpọọ ya ka ọ sonye na ndị nnọchi anya gárá Dakar na 1987 iji zute ndị nnọchianya nke African National Congress nke a chụgara n'oge ahụ.