ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Sam |
ụbọchị ọmụmụ ya | 25 Disemba 1945 |
Ebe ọmụmụ | Enúgwu |
Ụbọchị ọnwụ ya | 7 Ọgọọst 2011 |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ndu ihe nkiri |
Sam Loco Efe (ubọchị iri abụọ n'ise n'ọnwa Desemba afọ 1945 - ruo ụbọchị asaa n'ọnwa Ọgụstụ afọ 2011) , amụrụ Sam Loco Efeeimwonkiyeke na Enugu, [1]Ọ bụ onye ome ihe nkiri Naijiria na onye nduzi. [2] [3] [4] [5] [6] [7] [8]
A mụrụ Efe na Enugwu, Nna ya bụ Arase Efeimwonkiyeke, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ. Nna ya bụ onye agbụrụ Benin nke rụrụ ọrụ na ọwụwa anyanwụ Naijiria, nne ya bụ onye na-azụ ahịa na-ere akara. [9] O biri ezigbo ndụ nwata ya n'obodo Abakaliki dị na steeti Ebonyi ugbu a. [10] Nna ya nwụrụ mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị; Mgbe ahụ Efe nọrọ ihe karịrị afọ nkịtị iji nweta agụmakwụkwọ elementrị n'ihi na ọ na-enyere nne ya aka n'ịzụ ahịa ya iji nweta ego maka ezinụlọ. Ahụmịhe mbụ ya na ịme ihe nkiri bụ n'ụlọ akwụkwọ ya mgbe otu ndị na-eme ihe nkiri bịara ikpo ihe nkiri a na-akpọ Dọkịta N'agbanyeghị nke Onwe Ya, emesịa, ya na ndị otu ahụ kparịta ụka gbasara ihe nkiri na ihe ngosi nka. N’ụlọ akwụkwọ elementrị, ọ bụ onye otu dị iche iche gụnyere ọha ejije ihe nkiri nke mere nsụgharị Julius Caesar nke Shakespeare mere na emume omenaala nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na Abakaliki, egwuregwu ahụ bịara nke ikpeazụ na asọmpi ejije ahụ mana a mara Efe dị ka onye kachasị mma n’egwuregwu. nke mere ka ọ nweta ohere agụmakwụkwọ ka ọ gụchaa ụlọ akwụkwọ elementrị n'efu. Mgbe ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ elementrị, ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị iche iche ma na-arụsi ọrụ ike na nzukọ na-eme ihe nkiri, na-ahazi arụmọrụ nke Dọkịta n'agbanyeghị onwe ya na egwuregwu a na-akpọ Vendetta. [11] Mgbe ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ bụ onye otu ndị na-eme ihe nkiri na-eme njem na-agba bọl ma nweta aha otutu locomotive e gburu nkenke dị ka loco.
N'oge a na-alụ agha obodo, Efe lụrụ agha n'akụkụ Biafra ruo mgbe ọ laghachiri na Benin na-afọ 1968. Mgbe ọ nọ na Benin, ọ malitere otu ihe nkiri Ovonranwen [10] site na mbupute izizi ha bụ Ogierhiakhi's Obaiwape. [11] N'agbanyeghị, ego ọ na-enweta site na ịme ihe nkiri pere mpe mgbe emesiri, ọ gara Lagos iji chọọ ohere ọrụ ka mma yana ịtinye uche ya n'ịgba na bọọlụ. Ọ nwetara ọrụ mbụ ya na-afọ 1972 ịrụrụ Michelin Tires ọrụ. O tinyere akwụkwọ maka ọkwa ahụ n’amaghị ka e si anya ụgbọala nke bụ ihe achọrọ maka ọrụ ahụ. Ọ mụrụ otú e si anya ụgbọala otu ụbọchị tupu ajụjụ ọnụ ahụ. Mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, ọ gafere ajụjụ ọnụ ahụ wee daa ule ịnya ụgbọ ala mana ịkwụwa aka ọtọ banyere njehie ya na ikpe mere ka onye na-agba ajụjụ ọnụ hụ ya n'anya. [12] Ọ rụrụ Michelin ọrụ ire taya na Lagos, Ijebu Ode na Abeokuta. N'oge na-adịghị anya, ọ hapụrụ Michelin ga rụọ ọrụ na Dunlop Tires dịka Onye Nnọchiteanya Ọkachamara na ngalaba nke taya na ngwaahịa gbasara ya. Mgbe ọ na-arụ ọrụ na Dunlop dị na Benin, ọ bụ onye otu NTA Benin telivishọn n'usoro, Hotel de Jordan ma rụọkwa na nsụgharị nkeOla Rotimi 'The Gods are not to Blame. Na-afo 1977, ọ hapụrụ ahịa maka ọrụ na ihe nkiri. O mere nyocha ma nweta akụkụ nke Langbodo, egwuregwu nke Dapo Adelugba gosipụtara n'oge Festac. Ka Festac gachara, Adelugba kpọrọ ya gosi otu enyi ya na Mahadum nke Ibadan banyere ohere dị n'ihe nkiri. Enyi Adelugba nwere ikike nwetara Efe ọrụdị ka onye nka agadi ihe nkiri n'ụlọ ọrụ.
A hụrụ Sam Loco Efe mgbe ọ nwụrụ na ime ụlọ nkwari akụ n'ụtụtụ Sọnde. Emeghere ọnụ ụzọ ime ụlọ n'ikike mgbe ọ ịrịdataghi mgbe ọ dinara ụra n'abalị gara aga. Amabeghị ihe kpatara ọnwụ ya ruo ugbu a. Ọ nọ n'elu oche nwụọ n’ime ụlọ nkwari akụ ahụ ebe ihe ana eku n'imi Ventolin nọ n’akụkụ ya. Onye bụ osote onye isi oche nke ndị omekome Nzukọ ndị n'eme nka (AGN), Mr Steve Eboh, bụ ezigbo enyi Sam Loco kwadoro kwuru na Sam Loco nwere atụmatụ ịga n'ụlọ ọrụ ugbo ya na Ebonyi steeti wee zuo ike ebe ahụ obere oge mana ochicho obi ya ahu abịghị na mmezu. [13]