ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 29 Ọktoba 1967 |
Ebe ọmụmụ | Tudun Wada |
ọrụ ọ na-arụ | odee uri, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | onye otu ndi omeiwu nigeria |
ebe agụmakwụkwọ | Kaduna Polytechnic |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | People's Redemption Party |
Shehu Sani (amụrụ na 29 n'onwa Ọktoba nke afọ 1967) bụ onye omeiwu Naijiria, onye edemede, onye na-ede egwuregwu na onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ.[1] Ọ bụ onye isi oche nke Civil Rights Congress nke Nigeria - (CRCN). na onye isi otu aha ya bụ Hand-in-Hand, Africa.[2] Ọ bụ onye isi na ọgụ maka iweghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa. Ọ bụ ọchịchị ndị agha gara aga jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ na Naịjirịa. A tọhapụrụ ya n'ụlọ mkpọrọ ndụ ya niile mgbe e weghachiri ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa n'afọ 1999.
A mụrụ Sani na 29 Ọktoba n'afọ 1967 na Tudun Wada, Kaduna nke dị na Naijiria. Ọ gụrụ ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na Local Government Education Authority (LGEA), Badarawa Kaduna n'etiti afọ 1975 na 1980. Ọ debara aha ya na ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke Government Day, Kagara, Niger State, site na 1980 wee guchs na 1984, wee gaa na Government Science College School, Kagara. Ọ gakwara Kaduna Polytechnic site na 1984 ruo 1993 ebe ọ nwetara akara ugo mmụta na Injinia Ọrụ Ugbo.[3]
N'oge ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ na Kaduna Polytechnic nke dị na Kaduna Steeti, ọ bụ onye na-ahụ maka ụmụ akwụkwọ. Ọ bụ onye isi, Central Mobilization Committee nke PAN-African Student Organization na onye isi African Democratic Youth Congress. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nduzi mmekọrịta ọha na eze Kaduna State Students Union. Sani si n'ezinụlọ Naijiria nọ n'ọkwá dị n'etiti. Nna ya bụ onye njikwa mmepụta. Ọ zụrụ onwe ya na UK na Germany, ma rụọ ọrụ na akwụkwọ akụkọ a maara dika New Nigerian pro-Northern New Newspaper ruo afọ iri na atọ. Tupu nke ahụ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ebi akwụkwọ na Daily Mail nke dị na Steeti Kano.[4]
N'oge ọgba aghara okpukpe na Steeti Kaduna n'afọ 2000, ọ bụ naanị onye na-ahụ maka ikike mmadụ na Kaduna nke pụtara n'oké ihe ike iji katọọ ogbugbu ahụ. N'afọ 2005, a họpụtara ya ka ọ gbanwee ndị obodo na nzukọ mba. Ndị ọchịchị ọdịnala na nnọkọ ahụ rịọrọ ka a machibido Shehu Sani maka ikwu okwu mgbe ọ rịọrọ ka ha gbasaa n'ihi nkwado ha na-akwado onye ọchịchị aka ike n'oge gara aga. Onye isi oche nke kọmitii ahụ, aha ya bụ Justice Niki Tobi jụrụ oku ahụ.
Sani haziri ma duzie ngagharị iwe:
Sani nwere ọtụtụ akwụkwọ edemede ya, gụnyere:
Akwụkwọ
Egwuregwu
Abụ uri
Ọ bụ onye isi oche Kọmitii Senate na hụ màkà ụgwọ obodo na nke mba ọzọ ma bụrụkwa osote onye isi oche na Kọmitii Senator na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ.[11][12]