ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Simisola Kosoko |
Aha ọmụmụ | Simisola Kosoko |
aha ezinụlọ ya | Ogunleye |
aha pseudonym | Simi |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Eprel 1988 |
Ebe ọmụmụ | Ojuelegba, Lagos |
Dị/nwunye | Adekunle Gold |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, singer-songwriter, omee |
ebe agụmakwụkwọ | Covenant University |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2006 |
agbụrụ | Ndi Yoruba |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ngwa egwu | olu egwụ |
Ọrụ ama ama | Duduke |
ụdị | rhythm and blues, African popular music, Afrobeats, soul |
Ihe nrite | OkayAfrica 100 Women, 2015 Nigeria Entertainment Awards, The Headies 2016, City People Entertainment Awards |
webụsaịtị | http://www.iamsimi.com/ |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Simisola Kosoko Audio (nee Ogunleye; amụrụ ya ka ọnwa April di na mkpụrụ ụbọchi iri na itenani, n'afo 1988), bụ onye eji aha o ji eti egwu bụ Simi nwe mara bụ onye Naijiria na- agụ egwu, ede egwu ma ne-emekwa ihe nkiri. [1] [2] Ọ malitere ọrụ ya dịka onye na-abụ abụ ozioma, nwe wepụta egwu izizi ọ n'ụlọ ọbọ egwu ọ kpọrọ Ogaju n'afọ 2008 . [3]Amatara ya nke n,afọ 2014 mgbe O weputasiri egwu ya nke ọ kpọrọ "Tiff" , abụ a họpụtara dika Best Alternative Song na The Headies 2015 . [4] Simi na ndị ụlọ egwu a kpọrọ X3M Music binyere aka n'akwụkwọ n,afọ 2014, mana ọ hapụrụ ha n'ọnwa May afọ 2019 ka oge mbinye aka n'akwukwọ ahụ gwụrụ. [5] O wepụtara alụbọm ụlọ egwu nke abụọ ya bụ Simisola na kpụrụ ụbọchi asatọ n'ọnwa Septemba , n'afọ 2017. [6] [7] Alụbọm nke atọ ya bụ Omo Charlie Champagne, Vol. 1 pụtara ka o dabaa na ubochi ọ di afọ iri atọ na otu nke bụ mkpụrụ ụbọchi iri na itolu n'afọ 2019. O bidoro ụlọ egwu ya ọ kpọrọ Studio Brat n'ọnwa Jun afọ 2019. [8]
A mụrụ Simi na Ojuelegba, nke dị na Surulere , dịka nwa ikpeazụ n’ime ụmụ anọ. [9] Na mkparịtaụka ya na Juliet Ebirim nke akwụkwọ akụkọ Vanguard, Simi gosipụtara na ndị mụrụ ya kewara mgbe ọ dị afọ itolu. O kpughekwara na o tolitere dị ka tomboy. [10] Simi gara Stars International College, ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Ikorodu, Lagos State. [11] Ọ gara akwụkwọ na mahadum Covenant University , ebe ọ nwetara nzere na mass communication. [12]
Simi tolitere ịgba egwu na ịbụ abụ dịka onye otu ukwe ukwe nke ụka dị na mpaghara ya. O dere abụ izizi ya mgbe ọ dị afọ iri. [13] Ọlụ aka nka ya bidoro n’afọ 2008 ka e wepụtara album album ya bụ Ogaju nke izizi, nke nwere ọtụtụ egwu dịka “Iya Temi” na “Ara Ile”. Ọ bụ Samklef mepụtara album ahụ. [14]