ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 28 Novemba 1988 |
Ebe ọmụmụ | Abá |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | etiti etiti |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2005 |
ụdị egwuregwu | footbọl |
nọmba egwuregwu | 8 |
so na | 2013 Africa Cup of Nations |
Sunday Mba (amụrụ n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ1988) bụ onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ onye ikpeazụ onye ọgba bọọlụ Yeni Malatyaspor na ndị otu mba Naijiria . [1] [2]
Mba sonyeere otu egwuregwu Rangers na mgbazinye n'ọnwa Mee nke afọ 2013 site na Warri Wolves. Ọ nyere goolu na bọọlụ nke mbụ ya na otu egwuregwu Rangers na mmeri 3-1 Clube Recreativo Desportivo do Libolo meriri ha na 2013 CAF Champions League[3][4] O binyere aka na otu egwuregwu Bastia n'ọnwa Disemba mgbe emechara nkparịta ụka nke nọrọ ihe nwere ike iru otu afọ
N'ọnwa Ọktoba afọ 2019, mgbe afọ abụọ gachara na-onweghị otu egwuregwu, o kwuru na ọ chọrọ ịlaghachi na'ịgba bọọlụ.[5]
Ọ bụ onye otu nke abụọ Nigeria nke meriri Iko mba Afrịka WAFU 2010. O mere mpụta nke mbụ ya n'egwuregwu Eagles na Angola nke gwụrụ na onye lawa onye lawa n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2012. Ọ nyere goal na egwuregwu bọọlụ megide Liberia n'egwuregwu ya ọzọ.[6]
A kpọrọ ya ka ọ bịa n'òtù ndị ikom iri abụọ na atọ nke Naijiria maka iko mba Afrịka nke afọ 2013 .[7] Mba nyere goolu mmeri na mmeri 2-1 nke Naịjirịa meriri Ivory Coast. N'abalị iri nke ọnwa Febụwarị n'afọ 2013, n'egwuregwu ikpeazụ ya na Burkina Faso, ọ nyere goolu mbụ na naanị goolu nke egwuregwu ahụ, iji nye Naịjirịa iko mba Afrịka nke atọ.[8]
A họpụtara ya isonye ndị otu Naịjirịa na 2013 FIFA Confederations Cup.[9]