ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Tijjani |
ụbọchị ọmụmụ ya | 7 Disemba 1957 |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Kebbi |
ọrụ ọ na-arụ | political scientist |
onye were ọrụ | Mba Ndị Dị n'Otu |
Ọkwá o ji | President of the United Nations General Assembly, Permanent Representative of Nigeria to the United Nations |
ebe agụmakwụkwọ | Boston University, Ahmadu Bello University, Boston University College of Arts and Sciences |
Tijjani Muhammad-Bande | |
---|---|
Personal details | |
Children | 2004 |
Tijjani Muhammad-Bande GCON OFR (amuru 7 Disemba 1957) bu onye osote onye isi ala Naijiria, okammuta na oka mmụta ndọrọndọrọ ọchịchị bụ onye isi oche otu United Nations General Assembly 74th session site na 17 Septemba 2019 ruo 15 Septemba 2020. Ọ rụrụbu dịka osote onye isi oche Oge nke iri asaa na otu site na Septemba 2016 ruo Septemba 2017. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nnọchi anya Nigeria na-adịgide adịgide na United Nations kemgbe 2017.
Site na 2010 ruo 2016, ọ bụ onye isi ụlọ ọrụ National Institute of Policy and Strategic Studies na Kuru, Nigeria, ma bụrụkwa osote onyeisi ụlọ akwụkwọ mahadum Usmanu Danfodiyo site na 2004 ruo 2009.
N'ọnwa Jenụwarị 2021, Onye isi ala Buhari degharịrị ya aha dịka onye nnọchi anya United Nations na New York.
Muhammad-Bande mụrụ ma gụ akwụkwọ na Zagga, obodo dị na Kebbi steeti ugbu a.
Ọ gara mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria ebe ọ nwetara nzere bachelọ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'afọ 1979 tupu ọ gawa na Mahadum Boston, ebe ọ gụchara Master of Arts na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na 1981. Muhammad-Bande nwetara Ph.D. na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Toronto na 1987.
N'afọ 1980, ọ kụziri na mahadum Usman Danfodio dị na Sokoto wee ruo ọkwa onye nkuzi n'afọ 1998. N'agbata afọ 2000 na 2004, Bande jere ozi dịka onye isi ụlọ ọrụ African Training and Research Centre in Administration for Development na Tangier, Morocco. . N'agbata afọ 2004 na afọ 2009, ọ rụrụ ọrụ dịka osote onyeisi ụlọ akwụkwọ mahadum Usman Danfodio tupu a họpụta ya onye isi ụlọ ọrụ National Institute for Policy and Strategic Studies nke Naijiria, ọkwa ọ nọrọ n'afọ 2010 ruo 2016.
Ọ lụrụ di ma nwee ụmụ anọ.[1]
Templeeti:S-off Templeeti:S-bef Templeeti:S-ttl Templeeti:S-aft