ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20. century |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye nhazi ederede |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2003 |
Tunde Aladese bu onye ode akwukwo nke ndi Naijiria. N’afọ 2018, ọ natara onyinye Africa Movie Academy Award for Best Actress in a Leading Role . [1] N'afọ 2020, ọ dere ihe nkiri nke ga egosi ugboro 70 maka MTV Shuga nke ndị mere ya bukwa ndi nwe ya ha mere obodo gafere anọ nke na-akọwa coronavirus lockdown .
Aladese nwere mmasị na ihe nkiri site n'ụlọ akwụkwọ praịmarị ya ebe ọ nọ na klọb ejije ma nwee mmasị na Sound of Music Ọ mụrụ akwụkwọ bekee na University of Ibadan wee malite inye aka na ihe nkiri emere maka BBC na Naịjirịa. [2] Ọ chọrọ ide ma kọwaa ka esi ede ịhe nkiri nwe choputa na ịhe odere adịghị ya nma. Nke ahụ dị mkpa n'ihi na ọ mataziri ihe na-adịghị amasị ya. Ọ gara n'ihu ịmụ akwụkwọ na Met Film School nke dị na London na Berlin. O nwetara BA na Practical Filmmaking.
Aladese edeela ederede maka Edge of Paradise na Tinsel . [3] Ọ bụ onye ịsị edemede maka usoro Hotel Majestic . [4] N’afọ 2018, YNaija depụtara ya dịka otu n’ime mmadụ iri kacha ike na Naịjirịa n’eluri afọ 40. [5] Na 2018, ọrụ Aladese na Kenneth Gyang 's The Lost Café, mere ka a họpụta ya maka nwanyị kachasị na imeputa ịhe nkiri nke Africa Movie Academy Awards . [6]
Aladese malitere ide akụkọ maka MTV Shuga mgbe akpọrọ usoro ya Shuga Down South. Ọ dere akụkụ abụọ mana na 2019, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi edemede maka ọrụ ahụ. [7] N'oge nsogbu COVID-19, a gwara ya ka ọ dee edemede ụbọchị kwa ụbọchị maka MTV Shuga Alone Together nke na-egosipụta nsogbu nke Coronavirus . Emere ihe ngosi a izizi na 20 Eprel. Ndị na-akwado ya gụnyere United Nations . [8] E bere ịhe ngosị ahu bayere ka esị ebi na Nigeria, South Africa, Kenya na Cote D'Ivoire ma kọwaa ya site na mkparịta ụka ndị mere ya na ntanetị. Ndị mere Ihe nkiri niile bu kwa ndị kpokotebere ha. Atumatu usor ịhe nkịrị ahu kwesịsị iru oge 65. [2]