ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Julaị 1986 |
Ebe ọmụmụ | Ȯha Abia |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2001 |
Uche Elendu (amụrụ Julaị 14, 1983) bụ onye omee ihe nkiri,ọgụ egwu na [1] na onye ọchụnta ego nke Naijiria. [2] A kọwara ya dị ka otu n'ime ihu akacha ahụ kwamgbe na ụlọ ọrụ ihe nkiri Naijiria site na mpụta mbụ ya na 2001 ruo 2010 mgbe ọ sepụtụrụ ukwu na ụlọ ọrụ ntụrụndụ Naịjirịa. Dị ka akwụkwọ akụkọ Vanguard si kwuo, Elendu egosipụtala n'ihe nkiri sinima Naijiria karịrị narị abụọ. [1] [3] [4]
A mụrụ Elendu na steeti Abia nke dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa, nke ndị Igbo bi na Naịjirịa bi. Elendu bụ nwa mbụ nne na nna ya mụrụ ma nwee ụmụnne atọ ndị ọ tọrọ nke ha niile bụ nwoke. Nna ya bụ onye ọrụ bekee lara ezumike nka na onye ọchụnta ego ebe nne ya bụ onye nkuzi. Elendu gụchara B.Sc. ya na Mmekọrịta mba ụwa na Mahadum Imo steeti . [5]
Elendu sonyeere ụlọ ọrụ ihe nkiri Naịjirịa nke a na -akpọkarị Nollywood n'afọ 2001. Ọ gosipụtara àgwà ọrụ ya nkiri ya site n'akparamagwa ya n'ihe nkiri akpọrọ Fear of the unknown. n'N'ihi alụmdi na nwunye, Elendu weere ezumike ogologo oge na ihe omume ihe nkiri,nke mere ka aka ọrụ ya kpuọ na ala dị ka onye na -eme ihe nkiri. N'afọ 2015, ọ nwetara ọrụ dị mkpa ma pụta ìhè na ihe nkiri akpọrọ Ada Mbano. Ihe nkiri a bụ ihe mkpali nke kpaliteghachiri ya ime ihe nkiri .
Elendu na N'ajụjụ ọnụ ya na The Sun kwurịtara mbọ ya na -ịlaghachi na ụlọ ihe nkiri Nollywood mgbe ọ lọtachara ezumike ogologo oge ya. Ọ kọwakwuru ọrụ dị mkpa ihe nkiri Ada Mbano na mmetụta ọma o nwere na ọrụ ya. N'ajụjụ ọnụ a, ọ chịkọtara mmetụta ihe nkiri a na ọrụ ya site n'ịsị "Ihe nkiri nyerem ezi nlọha chi azụ bụ Ada Mbano " [6]
Elendu, agbanyeghị na ọ gbara alụkwaghịm ugbu a, lụrụ di na Jenụwarị 2012 n'obodo Owerri, Imo steeti [7] nke Walter Ogochukwu Igweanyimba nụ dị ya ma ha abụọ mụtara ụmụ abụọ ma ha abụọ bụ nwanyị. Elendu enwela ọtụtụ ihe mberede ụgbọala nke otu n'ime ha mere ka ọ ghara ịghọtacha onwe ya. [8] [9]
Elendu ekwuola n'ihu ọha gbasara ọnọdụ ahụike akpọrọ endometriosis, ọrịa a chọpụtara na ọ nwere. [10] [11] [12]