ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Ọktoba 1963 ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa, Asụ̀sụ̀ Ìgbò ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | odee egwu, odee uri ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of Nigeria, Long Island University ![]() |
Ebe obibi | New York City ![]() |
Uche Ndụka Audio (amụrụ ya na 14 Ọktoba1963) bụ onye Naịjirịa na onye Amerịka na-ede abụ, onye na-ede egwu, onye nkuzi na onye na-ede akwụkwọ. E nyere ya awọdụ maka nke ndị Abụ na Association of Nigerian Authors na 1997 [1] . O bi na New York City ugbu a .
Amụrụ Uche Ndụka na Naịjirịa na ezinaụlọ ndị otu Kristi. Aha ọmụmụ ya bụ Williams Uche Nduka, "O gosipụtara njimara Afrịka site na aha ya. O mere nkea mgbe Dr. Juliet Okonkwo dere otu akwụkwọ dị ogologo na-akuzi maka "ọdịbendị agbụrụ nke Afrika" [2] Ọ bụ onye azụlitere n'asụsụ abụọ, ha bụ Igbo na Bekee, ọ nwetara BA ya na Mahadum Nigeria, Nsukka na MFA ya na Mahadum Long Island, Brooklyn .
Ọ hapụrụ Nigeria na 1994 were biri na Germany mgbe ọ nwetasiri ihe ndị otu agụm akwụkwọ na Goethe Institute . O biri na Germany na Netherlands afọ iri sochirinụ tupu ọ were kwaga United Steeti na 2007.
Ọrụ Nduka bụ ihe ama ama maka ike ya na ngwa ngwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dịka Joyelle McSweeney siri kwue: " Na akwụkwọ m na-agụ, ọrụ Nduka niile bụ nrọ n'ihi nke a ọ bụ akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ụdịrị ya anaghị ekwu ihe nwere ike ime maobụ kwute maka ya, kama ha ga na-agba eziokwu okirikiri. Ihe a na-ahụ anya n'ọrụ Ndụka bụ ka o si enwe nnukwu mmetụta naanị sọọsọ na ọ bụ onye Naịjirịa na ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mana ọ bụ maka na ọ bụ onye si ala nna ya were gaa mba ọzọ were na-ebi ka ohu n'ala ahụ". Ndụka n'aka nke ọzọ kwuru: "Na njete aka, A bụ m onye na-eme ihe sọrọ m na-eleghi mmadụ anya, mata ma ha, a na-ebugo iwu asụsụ bekee elu maọbụ nke ndị na-asụ ya nke ọma; nke ọdịnala maọbụ nke ogbara ọhụrụ.A na m eji ụdịrị nka asụsụ ọbuụa sọrọ m, dika ọnọdụ m siri dị oge ahụ, na kwa isiokwu ọbụla m nwere mmasị na ya. Na ọmụmụ asụsụ, enwere ebe ndị di iche iche a na-emetụbeghị aka na Abụ. A na m anwa oke m ịchọpụta ihe ndi ahụ. A chọghị m ịche na ndị mmadụ na-atụ anya ka m were ihe ịhere were na-ede bekee". Ndụka bi na Brooklyn kịta. O so na otu Kristiania, nchịkọta ndị odee edemede nke Brooklyn.
Ndụka edeela ọtụtụ akwụkwọ na Abụ na ịdụazị nke gụnyere Nine East (2013), Ijele (2012), na eel on reef (2007), e bipụtara ha niile mgbe o rutere United Steeti. Nchịkọta akwụkwọ ya mbụ gụnyere Heart's Field (2005); If only the Night (2002); Chiaroscuro (1997), nke a turu ugo mmeri na Association of Nigerian Authors nke Abụ ya; The Bremen Poems (1995); Second Acts (1994); na Flower Child (1988). Belltime Letters (2000) bụ mkpokọta Ịdụazị [5] .