ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
obodo maka egwuregwu | Naijiria ![]() |
aha ezinụlọ ya | Sunday ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 9 Septemba 1994 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ ![]() |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | etiti etiti, gaa n'ihu ![]() |
ụdị egwuregwu | footbọl ![]() |
Uchechi Lopez Sunday (amụrụ na 9 Septemba 1994) bụ nwaanyị Naijiria na-agba bọọlụ dịka strika, ugbu a ọ na-agbara klọb FC Nordsjælland na asọmpi Gjensidige Kvindeliga. Ọ bụkwa onye otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa, a na-akpọ Super Falcons.[1][2]
Amụrụ Uchechi Sunday na Port Harcourt, Naijiria na 9 Septemba 1994 Ọ bụ nwa ikpeazụ n'ime nwa nwanyị asaa.[3][4]
Sunday malitere ọrụ ịgba bọl na 2004 na Rivers Angels F.C. na Naijiria. Site na 2009, o gbaara na ndi otu bọọlụ nke ụmụ nwaanyị bụ Nigerian Women's Premier League. Na 14 Eprel 2011, ọ banyere otu klọb ndị Switzerland bụ FC Neunkirch na Schaffhausen. Ọ gbaara ha ugboro iri na asatọ.[5] Na August n'otu afọ ahụ, mgbe a gbachara 2010 FIFA U-20 Women's World Cup na Germany, ọ laghachiri klọb ochie ya na Naijiria.[6] Na mbido 2015, Sunday sonyere otu egwuregwu ndị Belarus bụ FC Minsk. Ọ nyere goolu atọ na matchị izizi ya.[7] Na mmechi May 2015, ọ nyere goolu iri na anọ n'ime naanị egwuregwu ise.[8][9] Ọ nyere goolu nke iri na ise mgbe ọ pụtara na matchị nke isii ya na 20 June 2015.[10]
Na 11 August 2015, ọ pụtara na UEFA Women's Champions League na nke gbara Konak Belediyespor si Turkey. O nyere goolu ise n'ime asọmpị ahụ, nke mechiri 10-1 nke FC Minsk meriri. Ọ nyekwara otu goolu na matchị nke abụọ,[11] na goolu abụọ na nke atọ, ngụkọta goolu asato n'ime egwuregwu atọ nke otu ntozu.[12]
Mgbe ọ na-agbara ndị otu ụmụ nwanyị U-20 nke Naijiria, Sunday pụtara nke izizi ya na asọmpi FIFA na 2010 U-20 World Cup na Germany, e tinyere ya dị ka onye nnọchi mgbe ha na Mexico ndị Group C n'agba.[13][14] Ọ sonyekwere na asọmpi nke FIFA U-20 Women's World Cup na 2014 emere na Canada, ebe o nyere goolu atọ. Ọ nyekwara goolu atọ na 2014 African U-20 Cup of Nations nke ụmụ nwaanyị.[15]
O gbaara nke izizi ya na FIFA Women's World Cupwee pụta na egwuregwu atọ nke 2011 FIFA Women's World Cup Group A maka ndị otu egwuregwu bọọlụ nke ụmụ nwanyị Nigeria otu egwuregwu bọọlụ nke ụmụ nwanyị Naijiria.[16][17][18]
{{Reflist|refs=[19] [20] [21] [22] [23] [24] [25] [26]