Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ |
---|---|
ụdịekere | nwoke |
mba o sị | Naijiria |
Aha ọmụmụ | Uti Nwachukwu |
aha ezinụlọ ya | Nwachukwu |
ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Ọgọọst 1982 |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | University of Nigeria, Benson Idahosa University |
ogo mmụta | bachelor's degree |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2011 |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ihe nrite | Nollywood Movies Awards, Africa Movie Academy Awards |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Uti Nwachukwu onye amụrụ n'abalị̀ atọ nke ọnwa asatọ n'afọ 1982, bụ onye meriri na Big Brother Africa agba nke ise
Uti bụ onye nnọchi anya si Naịjirịa gbárá afọ iri abụọ na ise na Big Brother Africa agba nke ato.Ọ bụ ya bụ onye nke atọ achụpụru n'ụlọ nke Big Brother Africa àgbà nke atọ na abalị ise nke ọnwa Oktoba 2008 (ụbọchị nke iri anọ na abụọ). N'oge ọ́ kà nọ̀, amaara Uti dịka onye na-amasa ndị otu ya na ha n'emekọ ihe ọnụ (ọkachasị Mimi na Thami). N’oge a na-achụpụ otu onye nnọchianya ndị Namibia bụ Lucille, Uti kparaliri n'iwe na ọ̀nụ́nụ́ ọ́ nụ̀rụ̀ na a chụpụla ya.
N'afọ 2010 Uti sonyekwara ọzọ na asọmpi nke Big Brother Africa nke ise: Arinze nke ọ nọrọ ruo ụbọchị iri itoolu na otu wee mechaa merie Munya nke votu ikpe azu nke asatọ ruo asaa. Abalị otu narị na ụbọchị iri atọ na atọ agụkọtara ọnụ ka ọ nọrọ n'ụlọ Big Brother. Ọ́ bụ onye Ndokwa si na Obodo Aboh n'okpuru ọchịchị gọọmenti obodo Ndokwa-East nke Delta State Naịjirịa.
Uti malitere oru ime ihe ngosi ya na 2011. E gosipụtala ya n'ọtụtụ ihe omume fim kemgbe ahụ.