ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Uyaiedu Ikpe-Etim |
Aha ọmụmụ | Uyaiedu Ikpe-Etim |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1989 |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | filmmaker, onye nhazi ederede, onye na-emeputa ihe nkiiri, Onye na-akwado ikike LGTI, onye nhazi ndu ihe nkiri |
ebe agụmakwụkwọ | Eastern Mediterranean University, IIE MSA |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ihe nrite | BBC 100 Women |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Uyaiedu Ikpe-Etim (amụrụ 1989) bụ onye na-eme ihe nkiri na ala Naịjirịa, onye na-enyocha ihuenyo na onye na-eme ihe nkiri, onye na-emepụta ọrụ na-akọ akụkọ banyere ihe gbasara nwoke ma ọ bụrụ nwanyị idina ụdị onwe ha,igbanwe ụdị okikere mmekọahụ na amaghị ma a bụ nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị acikọtara kpọọ LGBTQ nke Naịjirịa. N'afọ 2020, BBC tinyere ya na ndepụta nke ụmụ nwaanyị nari nke afọ .
A mụrụ Ikpe-Etim n'afọ 1989. [1] Ọ bụ onye isi nchọpụta ụlọ ọrụ nke Hashtag Media House, kemgbe afọ 2011, ọ na-arụ ọrụ ikwuchitere ndị n'enweghị ọnụ na Naịjirịa ọnụ ha, ọkachasị ndị LGBTQ nọ n'ime ha. [2] A kpariala ikike obodo LGBT nke dị n'Africa nke ukwuu, Naịjirịa na ụlọ ọrụ ihe nkiri ya tinyere aka na nke a:Na otu ndi n'eme ihe nkiri Naijiria bụ Nollywood a na-ekwuto ndị na -edina ụdị onwe ha ma na -ahụ ha dị ka ndị mmekpa ahụ, nke adịghịmma akụ na ụba kpaliri ma ọ bụ nkwanye site na mmetụta nke òtù nzuzo na mgbaasị nke na -emecha bụụrụ̀ ntaramahụhụ n'ihi omume ha ma ọ bụ nwee nzọpụta ya site na ụka. [3] [4] [5] Ihe nkiri ndị ahụ na -egosi gbasara LGBTQ na Naịjirịa, na -egosipụtakarị umu nwoke idina ụdị onwe. [6]
N'afọ 2020, Ikpe-Etim na onye na-eme ihe nkiri bụ Pamela Adie bịara bụrụ onye ama ama na Naịjirịa n'ihi mmepụta fim ha bụ Ìfé . [7] Ihe nkiri a bụ nke mbụ Ikpe-Etim duziri wee gosi akụkọ ịhụnanya n'etiti ụmụ nwanyị abụọ. [1] Ìfé abụghị ihe nkiri gosipụtara mmekọ nwanyi na nwanyị mbụ a ga-emepụta na Naịjirịa, mana ọ bụ nke mbụ gosipụtara ụdị mmekọrịta na-adịkaarị, na-enweghị ajọ mbunobi ma ọ bụ echiche efu. [4] [7] N'ezie, ndị mmepụta, ndị ndidi na ndị ome ihe nkiri a bụ ndị òtù LGBTq. [2] Agbanyeghị na Ikpe Etim bụ onye pụrụ iche onye otu nke n'amaghị ma ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị,mmepụta ahụ ga-eche ihu nyocha National Board of Film and Video Censors, nke rumiri aka ime ka ndị mepụtara ihe nkiri a ga mkpọrọ na n'ihi ntinye aka ha na nkwado ha na mmekọ nwoke na nwoke" ma ọ̀ bu nwanyị na nwanyị na obodo iwu machibidoro ịlụ nwoke na nwoke ma nwanyị na nwanyị kemgbe afọ 2014. [7] N'ezie, iji zere ime nnyocha, ewepụtara ihe nkiri a na mba ofesi na Ọktoba 2020, na ememme Nkiri Toronto LGBT. [5] [8] E wepụtara ya n'ikpeazụ n'nchikọta nke ndi ehtvnetwork.com. [9] Edere ya na Leeds International Film Festival na Nọvemba 2020. [10]
Okwu Uyaiedu na TEDx: Ịghọ nnwere onwe nke English Box na nke a ọ jụrụ ajụjụ ebe ọchịchọ gbasara ndobe njirimara Afrịka si bịa. N'ọnwa Ọgọstụ 2017, Uyaiedu kwuru okwu na Mahadum Eastern Mediterranean na mkpa ọ dị ịjụ ajụjụ.
N'afọ 2020 edepụtara Ikpe-Etim dị ka otu n'ime ụmụ nwanyị BBC otu narị nke afọ 2020, na nhụta ntinye ya na ihe gbasara ikike ụmụ nwanyị na Naịjirịa. [11] [12]