ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 18 Disemba 1990 |
ọrụ ọ na-arụ | taekwondo athlete |
ụdị egwuregwu | taekwondo |
Uzoamaka Otuadinma (amụrụ 18 Disemba n'afọ 1990) bụ nwaafọ Naijiria na-eme taekwondo. [1] [2] Ọ na-asọ asọmpi na ihe omume 73kg ma merie nrite ọla edo na Taekwondo Afrịka Games na ọla nchara na mbipụta 2019 nke emere na Rabat .
Na asọmpi Taekwondo nke Commonwealth nke 2014 emere na Edinburgh, o nwetara akara nchara [3] .N'afọ sochirinụ, ọ sonyere na Egwuregwu Afrịka nke 2015 na Brazaville ma nweta ihe nrite ọla edo na mmemme Women's Middleweight - 73kg . Na asọmpi Olimpik Games nke afọ 2016 emere n'Agadir, ọ ritere ọla nchara na mmemme ya n'arọ iri isii na asaa. Na asọmpi Korea Open na Chuncheon n'afọ 2019 Naijiria Open na Abuja, o ritere ọla ọcha. N'afọ 2019 Naijiria Open mere naAbuja, ọ ritere ihe nrite ọla edo. Na asọmpi Afrịka nke afọ 2019 emere na Rabat, ọ nọchitere anya Naịjirịa ma nweta ọla nchara [4][5].