Vida Amaadi Yeboah | |
---|---|
Member of parliament for Akwapim South Constituency | |
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]] | |
In office Templeeti:En dash range | |
Preceded by | John Jerry Rawlings |
Member of parliament for Akwapim South Constituency | |
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]] | |
In office Templeeti:En dash range | |
President | John Jerry Rawlings |
Personal details | |
Born | Akwapim South, Eastern Region Ghana) |
27 Julaị 1944
Died | 27 Ọgọstụ 2006 | (aged 62)
Nationality | Ghanaian |
Political party | National Democratic Congress |
Alma mater | University of Ghana |
Occupation | Politician |
Profession | Teacher, Civic Leader |
Vida Amaadi Yeboah (1944-2006) bụ onye nkuzi Ghana, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye isi obodo.[1] Osote Minista nke Mmụta na Ọdịbendị site na afọ 1988 ruo afọ 1993, Yeboah nyere aka guzobe Forum for African Women Educationalists (FAWE) na 1992. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu na 1992, Yeboah ghọrọ onye otu gọọmentị Jerry Rawlings, na-eje ozi dị ka minista njem nleta site na afọ 1997 ruo na afọ 2001.
A mụrụ Vida Yeboah na 27 Julaị, na afọ 1944 n'obodo nne ya na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, nwa nwanyị nke Kate Oye Ntow Ofosu na Eric Perigrino Nelson. Ọ gụrụ akwụkwọ na Wesley Girls High School tupu ọ nweta BA ya na French na Mahadum Ghana . Ọ gụrụ maka MA na French na Mahadum Bordeaux na France, na diplọma post-graduate na agụmakwụkwọ na Mahadim Cape Coast.[2]
Ọ kụziri ihe afọ iri na anọ n'ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị na Ghana, ọ ghọrọ onye isi ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụmụ nwanyị Mfantsiman, tupu a họpụta ya dịka osote odeakwụkwọ maka agụmakwụkwọ n'afọ 1985.[3]
Site na afọ 1988 ruo afọ 1993 Vida Yeboah bụ osote minista nke agụmakwụkwọ na ọdịbendị.[4] Yeboah gbanwere usoro agụmakwụkwọ tupu mahadum, na-eme ka ọnụ ọgụgụ ụmụ agbọghọ na-aga.[5] N'afọ 1992, ya na ụmụ nwanyị anọ ndị ọzọ na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Afrịka guzobere Forum for African Women Educationalists: Fay Chung na Zimbabwe, Simone Testa na Seychelles, Paulette Moussavon-Missambo na Gabon, na Alice Tiendrebengo na Burkina Faso.[6]
A họpụtara Vida ka ọ nọchite anya Akuapim South na nzuko omeiwu mbụ nke mba nke anọ nke Ghana na 7 Jenụwarị, na afọ 1993 mgbe a kwupụtara na ọ bụ onye mmeri na ntuli aka ndị omeiwu Ghana nke afọ 1992 nke e mere na 29 Disemba, na afọ 1992.
A họpụtara ya ọzọ n'ime ndị omeiwu nke abụọ nke mba nke anọ mgbe ọ nwetasịrị pasent 48 nke votu na ntuli aka afọ 1996.[7] A họpụtara ya na afọ 1997 dị ka Minista nke Njem ebe ọ jere ozi ruo afọ 2001, ọkwa minista na-abụghị nke Cabinet.[4]
A na-echeta Vida Yeboah dị ka otu n'ime ndị guzobere Forum for African Women Educationalists (FAWE) Ghana's Chapter.[8]