ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Morocco ![]() |
aha n'asụsụ obodo | ياسمينة بادو ![]() |
aha enyere | Yasmina ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Ọktoba 1962 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Rabat ![]() |
Ńnà | Abderrahmane Baddou ![]() |
Dị/nwunye | Ali Fassi-Fihri ![]() |
Ikwu | Taieb Fassi Fihri, Ali Baddou, Mohamed El Habib Fassi-Fihri ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọka iwu ![]() |
Ọkwá o ji | Member of the House of Representatives of Morocco, Minister of Health and Social Protection ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Mohammed V University ![]() |
isi agụmakwụkwọ | private law, commercial law in Morocco ![]() |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Istiqlal Party ![]() |
Ihe nrite | Grand Cross of the Order of Civil Merit ![]() |
Yasmina Baddou (Arabic) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Moroccan nke otu Istiqlal . N'agbata afọ 2007 na afọ 2012, ọ nọ n'ọkwa Minista na ahụ maka Ahụike na kọmitii nke Abbas El Fassi, ọ bụkwa odeakwụkwọ nke steeti maka ihe gbasara ezinụlọ na kọmiti Driss Jettou.[1][2][3]
Yasmina Baddou gụrụ akwụkwọ na "Mission laïque française" (Lycée Descartes nke Rabat) ma nwee nzere masta na iwu na Mahadum Mohammed V nke Rabat, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọka iwu tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[2]
Ọ bụ nwa nwanyị nke Aicha Bennani na Abderrahmane Baddou, onye nnọchi anya mba Morocco, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye bụbu onye nnọchiteanya ma lụọ Ali Fassi Fihri, nwanne Taieb Fassi Fahri onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ nke Morocco.[2]
Nwanne nne ya bụ Aziza Bennani bụ odeakwụkwọ nke steeti maka ọdịbendị na kọmitii Abdellatif Filali ma bụrụ onye nnọchi anya Morocco ugbu a na UNESCO.
Nwa nwanne nne ya Ali Baddou, bụ onye na-akwado Le Grand Journal, ihe ngosi okwu kwa ụbọchị nke ụlọ ọrụ ihe onyonyo French Canal+.
<ref>
tag; name "bio" defined multiple times with different content