ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Yewande Adekoya ![]() |
Aha ọmụmụ | Yewande Adekoya ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Jenụwarị 1983 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Lagos ![]() |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ederede ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Babcock University ![]() |
ogo mmụta | bachelor's degree ![]() |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2002 ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
Ihe nrite | City People Entertainment Awards ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Yewande Adekoya Audio (amụrụ na 20 Jenuwarị 1984), bụ Nwaanyị Naijiria n'eme ọrụ ihe nkiri, onye n’eduzi ihe nkiri, na onye na-emeputa ihe nkiri.[1][2]
A mụrụ Yewande na Lagos Steeti mana o si Ososa-Ijebu na Ogun Steetị ndịda ọdịda anyanwụ Naijiria.[3] Ọ gara ụlọ akwụkwọ ọta akara na ụlọ akwụkwọ praịmarị Bright star, tupu ọ gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Bright Star Comprehensive High School. O nwetara nzere bachelọ (BA) na Mass communications site na Babcock University. Yewande Adekoya lụrụ di muta ụmụ.[4]
Yewande Adekoya bidoro ime ihe nkiri n’afọ 2002 ya na otu ụlọ ihe nkiri bụ Alphabash Music And Theater Group. Ọ depụtara ma mepụta ọrụ mbụ ya na 2006 akpọrọ “Life Secret”. O mepụtala, duzie ma gosipụta n'ọtụtụ ihe nkiri dịka Omo Elemosho, ihe nkiri 2012 nke gosipụtara Bimbo Oshin, Muyiwa Ademola na Yomi Fash-Lanso.[5] Ihe nkiri ahụ natara nhọpụta ise na 10th Africa Movie Academy Awards.[6] A họpụtakwara ya maka "onye ọhụụ kachasị mma" na ngalaba Yoruba na 2014 City People Entertainment Awards.[7] N'otu afọ ahụ, ọrụ ya na Kudi Klepto nwetara ya nhọpụta nke nwaanyị ihe nkiri kachasị mma na mmemme 2014 Best of Nollywood Awards.[8] N’ọnwa Disemba afọ 2014, o ritere “onye ga-eme ofuma n'oge n'adighi anya” na mmemme nke Yoruba Movie Academy Awards.[9] Ihe nkiri ya bụ Kurukuru nwetara ya onyinye nsọpụrụ onye ihe nkiri kacha mma na mmemme ihe nkiri nke 2016 ACIA.[10] N’afọ 2017, ihe nkiri ya bụ Iyawo Adedigba nwetara ya onyinye nsọpụrụ ọzọ maka “ihe nkiri kacha mma nke afọ ahụ” na 2017 City People Movie Awards.[11]