Zohra Bensemra

Zohra Bensemra (amụrụ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1968) bụ onye Algeria n'ese foto nke n'arụ ọrụ na Middle East, Afrịka na Eshia. Ọ bi n'Afrika ugbu a.

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Zohra Bensemra na mba Algiers, Algeria, n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1968. Ọ tolitere ịhụ nwanne ya nwoke nke okenye ka ọ n'ese foto. N'ihe dị ka afọ isii, ọ malitere iṅomi ya ma were igwe foto ya mgbe ọ na-anọghị n'ụlọ. Otu ụbọchị nwanne ya nwoke chọpụtara ihe ọ n'eme ma tie ya mkpu, mana o mechara nye ya obere igwe foto maka onwe ya wee malite site na ise foto nke ụmụ klas ya.[1]

Bensemra arụwo ọrụ dị ka onye nta akụkọ foto kemgbe afọ 1990. O kwuru na profaịlụ Reuters ya na mbụ ọ dị ya ka onye n'ese foto n'afọ 1995: oge mbụ ọ hụrụ ozu na ndụ ya. E nwere bọmbụ ụgbọ ala n'etiti isi obodo Algeria, nso ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na ebe ọrụ ya. Ihe mbụ ọ hụrụ bụ ozu nwanyị gbara ọkụ n'ala. N'echi ya, ọ tetara ma nwee mmetụta nke ịbụ ezigbo onye n'ese foto. O kwenyesiri ike na iji nwee ihe ịga nke ọma, ọkachasị n'ọrụ dịka foto akụkọ, mmadụ ga-amụta ịnabata ihe ịma aka ndị n'abịa na ya.[1] O bu ụzọ rụọ ọrụ na Reuters dị ka onye n'arụ ọrụ n'oge Agha Obodo Algeria n'afọ 1997. N'afọ 2000, ọ kọrọ banyere esemokwu dị n'etiti ndị obodo Albania na ndị Serbia na Masedonia. E zigara ya Iraq n'afọ 2003. Mgbe ọ na-arụ ọrụ na Najaf, ọ ghọrọ onye n'ese foto maka Reuters. Ọ kọrọ banyere ntuli aka nke ndida Sudan, n'afo 2011, mgbanwe mba Tunisia, 2011 Agha Obodo Libya, na agha Mosul n'afọ 2017. [2] Ọ dabeere dị ka onye isi foto Reuters na obodo Pakistan (2012-2015) ma n'ebi ugbu a na Kontịnent Afrika dị ka onye n'ese foto n'odida anyanwu Afrika.

  1. 1.0 1.1 Zohra Bensemra. Reuters. Retrieved on 26 June 2016. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. "Photographer notebook: Zohra Bensemra", Reuters Full Focus. Retrieved 9 April 2013.