Áki bụ mkpụrụ nke nọ n'ime mkpụrụ nkwụ a na ata-ata . Mkpụrụ osisi nkwụ a na-enweta mmanụ abụọ dị iche: mmanụ nkwụ na- esite na ụru nkwụ mpụta, yana elu-áki nke na-esi na ákì pụta.
Avuvu ákì bụ ihe na-afọ ma apipụtacha mmanụ na ákì akwọrọ-akwọ, nke a na aghọ erimeri ehi ma ọ bụ ejiri ya na-emeho ọkụ ma na-akwanyekwa ọkụ n'ime obodo.
Avuvu ákì na n'enye ihe nke ndi bekee n'akpọ faiba na Protini na ahụ ụmụ anụmanụ dika ehi na ewu. [1] [2] Tinyere ihe ndị ọzọ bụ erimeri ụmụ anụmanụ, avuvu ákì ka avuvu ákì-bekee nma yana nke koko. mana avuvu nke azụ na nke mgbamgba-ekere ka ya enye ihe n'ahụ nke a n'akpọ protini.
Ihe mejupụtara ya bụ faiba 16%, avuvu ákì nwekwara ihe ndi ọzọ ọ na enye nke ndi bekee n'akpọ phosphorọs na kalziụm nke na edozi ọkpụkpụ. Onwekwara ihe ndi ọzọ: Magneziụm, Ayọn na zink. [3] Ihe ndi ozo atuputara maka inye umu ehi nri bu ahihia kernel (50%), molasses (5%), ahihia (42%), nzu (1.5%), premix mineral (1%), na nnu ( 0,5%), ya na trace element / vitamin premix.