aha mkpirisi | Kano, Kano |
---|---|
A gụrụ aha | Aminu Kano |
mba/obodo | Naijiria |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Kano |
nhazi ọnọdụ | 12°2′51″N 8°31′28″E |
date of official opening | 1936 |
ebe a na-eje ozi site n'ọdụ ụgbọ njem | Kano |
state of use | in use |
runway | 06/24, 05/23 |
IATA airport code | KAN |
ICAO airport code | DNKN |
Àtụ:Infobox airportỌdụ Ụgbọelu Mba Ofesi Mallam Aminu Kano (bu ọdụ ụgbọ elu mba ofesi na- eje ozi na Kano, isi obodo Kano Steeti nke Naijiria . Ọ bụ ọdụ ụgbọ elu Royal Air Force tupu mba ahụ enwere onwe ya. Ọ bụ ọdụ ụgbọ elu na-eje ozi n’ebe ugwu Naịjirịa ma agụrụ ya aha onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Aminu Kano . Ọdụ ụgbọ elua nwere ọnụ mba na nke ụlọ . Ọrụ nwughari malitere na ọnụ ụlọ ọhuru nke ụlọ ọrua ma a gbapekwara ya na ụbochi iri abụọ na atọ nke ọnwa May 2011. N’afọ 2009, ọdụ ụgbọelu lebara ndị njem dị puku narị atọ na ịrị abụọ na atọ na narị anọ na iri asatọ na abụọ anya. Otutu ụgbọ elu mba ofesi na-elekọta ọtụtụ ndị obodo Lebanọn dị na Kano na njem alakụba Alakụba ana aga na Mecca.
Ọdụ Ụgbọ elu mba ụwa Mallam Aminu Kano bụ nke kacha ochie na Naịjirịa na ụgbọelu mbụ rutere na Naịjirịa rutere Kano na afọ 1922, ma irụ ọrụ bidoro na afọ 1936. N'ime iri afọ ndị mbụ nke ọrụ, ọ ghọrọ ebe nkwụsị maka mmanụ dị mkpa nye ụgbọ elu na-efe ọrụ ogologo oge n'etiti Europe na Africa. Ụgbọ elu ndi Ọhụrụ achọghị nkwụsị mmanụ dị otú ahụ, tịnyekwara njedebe nke akụ na ụba Kano na ngwụsị narị afọ nke ịrị abụọ, ọtụtụ ụgbọ elu mba ụwa kwụsịrị ime njem site na ọdụ ụgbọ elu ahụ. Mgbe ha kwụsịrị ọrụ ha ebighebi na Kano na afọ Juun 2012, KLM bụ naanị ụgbọ elu si mba Europe na-eje ozi na Kano, nke ha mere na-enweghị nkwụsị kemgbe afọ 1947. [1]
Ọdụ ụgbọ elua na-efe ụgbọ elu ndị nkịtị na nke ndị agha. A na-ejikarị Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 06/24 eme ihe maka ụgbọ elu ndị nkịtị, ebe Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 05/23 na-arụkarị ọrụ maka ọdụ ndị ọrụ Ndọkwa ọbọdọ Nigeria dị na ndịda ọdụ ụgbọ elua. Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 05/23 nọ na arụ ọrụ niile mgbe agbazigharịrị ọkpọrụzọ nke ịsi na mbido narị afọ nke iri abụọ na otu. Ọdụ njedebe ụgbọ elụ ahụ dị n'agbata okporo ụzọ abụọ ahụ.
Kano VOR-DME (njirimara: KAN) na mgbama ndị na-enweghị ntụzi (njirimara: KO na AO) dị na mpaghara ama. [2] [3] [4]
Ọdụ njedbe ụgbọ elụ nke pụtara ịhe na ụlọ elu na-achịkwa ụfe bu ha na-efe ụgbọ elu mba ụwa na ọrụ ụlọ nke Arik Air na-arụ . Akụrụngwa ndị dị na ọgbe ezumike nchere ọpụpụ dị ntakịrị, yana ebe ngọsi akwụkwọ akụkọ dị nso na tebụl ndenye ego na obere ụlọ mmanya n'akụkụ ebe ụgbọ elụ na anọ. Onwere obere ulo ezumike maka ndi njem dị ezigbọ Mkpa. Ụlọ ọrụ ahịa ndi na-enweghị ụtụ mechịrị emechi ka ọdi ụgbụa. E nwere obere ụlọ mmanya na ụlọ ọrụ nzipu ozi na ọgbe mbata. N'ebe ndịda ọdụ ụgbọ elu, n'okporo ụzọ akara ya bụ 06/24, bụ ọdụ njedebe ụgbọ elụ ụlọ nke na-arụ ọrụ ugbua maka ụgbọ elu nke IRS . Akụrụngwa ndi ahu gụnyere ebe a na egọsi ma na-ere akwụkwọ akụkọ na obere ụlọ mmanya. Ịwu ọdụ njedebe ụgbọ elụ nke ụlo ohuru di n'akụkụ ụlọ ọdụ njedebe ụgbọ elụ nke pụtara ịhe, malitere na mmalite narị afọ nke iri abụọ na otu. A gbahapụrụ ọrụa ma maliteghachiarịa ya. Onye na-ahụ maka ọdụ ụgbọ elu ahụ, Federal Airport Authority Nigeria (FAAN), hụrụ nrụcha nke ọdụ ọhụrụ ahụ na ọnwa Nọvemba afọ 2009. A gbapere ya maka ibidọ ọrụ na ọnwa Mee afọ 2011.
Ihe ndekọ data a na-egosi ọnụọgụ ndị njem na-abanye n'ọdụ ụgbọ elu, dịka nchọpụta ndị ngalaba Nchịkọta jikọrọ ụgbọelu nke Federal Airports Authority nke Naijiria kwuru.
Afọ | 2005 | 2006 | 2007 | 2008 | 2009 | 2010 | 2011 | 2012 | 2013 | 2014 | 2015 |
---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|
Ndị njem | 302,017 | 349,057 | 381,862 | 363,290 | 341,367 | 381,841 | 448,792 | 369,132 | 327,267 | 433,263 | 389,530 |
Uto (%) | 3.13% | 15.58% | 9.40% | 4.86% | 6.03% | 11.86% | 17.53% | 17.75% | 11.34% | 32.39% | 10.09% |
Isi mmalite: Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN). Akụkọ Ngalaba Ụfe ụgbọelu (2010-2013, [5] 2014, [6] Q3-Q4 nke afọ 2015, [7] na Q1-Q2 nke afọ 2016, [8] ) |
Àtụ:Air Force Historical Research Agency</img>Ederede a metukwara aka na ihe akụkọ ndị diri ọhaneze sitere n'akara ịntaneti a http://www.afhra.af.mil/