ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Elisabeth Adekogbe |
aha enyere | Elizabeth |
aha ezinụlọ ya | Adekogbe |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1919 |
Ebe ọmụmụ | Ibadan |
Ụbọchị ọnwụ ya | 1968 |
Dị/nwunye | Adekogbe |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | activist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, civil service |
Ọkwá o ji | Tribal chief |
ebe agụmakwụkwọ | Yaba College of Technology, St Agnes Catholic High School |
prefix nsọpụrụ | Tribal chief |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Action Group |
agbụrụ | Ndi Yoruba |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Chief Elizabeth Adekogbe (1919 - 1968) [1] [2] bụ onye obodo Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị,onye ndú oke ụmụ nwanyị na onye ọchịchị omenala . Ọ bụbu onye isi ndi otu Women's Movement of Nigeria nke dị na Ibadan . N'afọ 1954, otu ahụ gbanwere aha ya zawa Council of Women of Nigeria, bụ nke sonyere Women's Improvement League n'afọ 1959 were bụrụ National Council of Women Societies, [3] bụ ndị otu mgbagha na ndị otu na-edu ụmụ nwanyị na Naịjirịa.
A mụrụ Adekogbe n’ezinụlọ nke Ijebu-Ife n’afọ 1919. Ọ gụrụ akwụkwọ na St Agnes Catholic Training School nakwazị Yaba College of Technology . N’oge na-adịghị anya ọ banyere ọrụ obodo were bụrụ osote onye isi ndị na-enyocha ọnụahịa n’oge World War II. [1]
E hiwere otu Women's Movement na Ibadan n’afọ 1952. Ebumnuche otu a bụ ịdịnotu ụwa niile, ịnabata ụmụ nwanyị na Native Authority councils, nhọpụta nke ndị otu nọ na Western House of Assembly, ị debanye aha ọtụtụ ụmụ agbọghọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mbelata ego isi nwanyị a na-akwụ na njikwa ike nnwekọta ndị ahịa Sịrịa na Lebanọn. [3] Nzukọ a na-esonye na Action Group mgbe ụfọdụ. Kosiladị, naanị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ole na ole ma ọ bụ efu na-etinye ụmụ nwanyị ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị na ntụliaka gọọmentị etiti oge ahụ, n'agbanyeghị na ụmụ nwanyị tụnyere nnukwu òkè na ntuli aka n'oge ahụ. Otu ndị inyom dị iche iche a yiri naanị ihe e ji nweta vootu .
N’afọ 1953, e nwere nzukọ ụmụ nwanyị n’Abeokuta . Nzukọ ahụ nwere nzukọ ndị isi ndị inyom niile dị na Naijiria. Otu onye ndu ọgbakọ ahụ, Funmilayo Ransome-Kuti, bụ onye nwere ihu ọma n'ebe National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC), kpọrọ ọgbakọ ahụ: Federation of Nigerian Women Society. Kosiladị, e nwere ọgụ echiche dị n’etiti ụmụ nwaanyị abụọ a ma ama n’ọgbakọ ahụ: Adekogbe na Kuti. E meriri Adekogbe, ọ hapụ ọgbakọ ahụ. Mgbe e mesịrị, ọ kwadoro njikọ ndị otu ụmụ nwanyị nke Action Group. [4]
Dika onye isi ndi Yoruba ndi nke ya, o jidere aha Iyalaje nke Ikija.
Di ya bụ L.A.G Adekogbe bụ onye ọrụ bekee.