Mahadum Maiduguri (UNIMAID) bu ụlọ akwụkwọ gọọmenti etiti di elu nke di na Maiduguri, isi obodo Borno State a mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ Naijiria . Ọ bụ gọọmentị etiti nke Naijiria guzobere mahadum ahụ na-afọ 1975, na ebumnuche nke ịbụ otu n'ime ndị isi ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị elu na mba Naijiria. [1] Ọ na-edebanye aha ụmụ akwụkwọ puku iri abụọ na ise na mmemme ya dị iche iche, nke gụnyere kọleji nke ọgwụ na ikike nke ọrụ ugbo, nka, eze, agụmakwụkwọ, injinia, iwu, sayensị njikwa, ahịa ọgwụ, sayensị, sayensị mmekọrịta mmadụ na sayensị anụmanụ . Site na agbamume nke gọọmentị etiti, mahadum a na-adịbeghị anya na-amụba na mgbalị nyocha ya, ọkachasị na ngalaba ọrụ ugbo na mkpebi esemokwu, yana ịgbasa ozi ụlọ ọrụ mahadum. Ngụkọta ego bụ ₦ Otu Ijeri, Nde Itoolu na puku nari abụọ, narị isii na puku iri isii, narị isii na iri abụọ na-atọ na iri na otu Naira. Mahadum bụ nnukwu ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ ka elu na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ.. [2]
N’isi ụtụtụ n'ụbọchi iri n'isii n'ọnwa Jenụwarị, afọ 2017, e nwere ogbunigwe ogbu onye gbara ya n’ụlọ alakụba na Mahadum. Mgbawa ahụ gburu mmadụ anọ, gụnyere Prọfesọ Aliyu Mani na otu onye n'ime ndị wakporo ya, wee merụọ mmadụ iri na asaa ahụ. [5][6][7] E bugara ndị merụrụ arụ n’ụlọ ọgwụ dị na Ụlọ ọgwụ mmụta Mahadum Maiduguri. [8] Onye mwakpo ọzọ, nwata nwanyị gbara afọ iri na abụọ, ka akọwara na ndị uwe ojii gbagburu mgbe ọ bịarutere mahadum, wee gbawaa ihe mgbawa ya oji nke gburu ya. Mbuso agha a bụ ọrụ aka onyeisi ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau . [9] Ọnụ ọgụgụ ndị mwakpo ahụ metụtara dịgasị iche n'etiti akụkọ, mana otu n'ime ndị ahụ tụrụ bọmbụ bụ nwa agbọghọ nọ n'afọ iri na ụma.
Ndị ogbunigwe ogbu onwe atọ wakporo Mahadum a na n'ụbọchi iri abụọ na ise n'ọnwa juun na ụbọchị iri na isii n'ọnwa Juun, afọ 2017, gburu otu onye nche. [10] Mahadum amalitela igwu olulu dị kilomita iri abụọ na asaa gburugburu ya iji gbochie mwakpo ndị Boko Haram [11]
↑Umar. "Bombers at Nigeria's Maiduguri University kill professor", San Francisco Chronicle, January 16, 2017. “Three suicide bombers, including a child, exploded at dawn Monday at Nigeria's northeastern University of Maiduguri, killing a university professor and another child, witnesses and police said [...] He said 15 wounded people were evacuated to hospitals. The National Emergency Management Agency which carried out the evacuations put the wounded at 17.”
↑Hussain. "At least three dead in Nigeria suicide attack", Yahoo News, January 16, 2017. “Islamist group Boko Haram, which has repeatedly used young women and girls as human bombs, claimed responsibility for the attack. "We are the ones that triggered the explosions in the University of Maiduguri," said Boko Haram leader Abubakar Shekau in an audio message. "A woman can fight when the need arises."”
↑Reuters. "Suicide Bombers Kill 9 in Nigerian City of Maiduguri", Voice of America, June 27, 2017. “Borno police said a male suicide bomber killed a security guard after entering the University of Maiduguri, near the city center, on Sunday evening at 10:20 p.m. (2120 GMT) [...] Two female suicide bombers were the only people to die in two blasts at the University of Maiduguri on Monday morning at around 4:20 a.m. (0320 GMT).”